1 Samuel 17

Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”

1 Samuel 17:47 (UKJV) And all this assembly shall know that the LORD saves not with sword and spear: for the battle is the LORD's, and he will give you into our hands.

45Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị.

46Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.

47Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”

48Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya.

49Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.