46Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.
47Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”
48Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya.
49Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala.
50Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.