1 Samuel 17

Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.

1 Samuel 17:50 (UKJV) So David prevailed over the Philistine with a sling and with a stone, and stroke the Philistine, and slew him; but there was no sword in the hand of David.

48Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya.

49Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala.

50Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.

51Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ.

52Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.