3Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha.
4Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ Golaịat, onye obodo Gat, sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị Filistia pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ.
5O kpu okpu agha e ji bronz kpụọ, ma yiri uwe agha nke ịdị arọ bronz e ji kpụọ ya ga-erukwa iri kilogram ise na asaa.
6O yikwa ihe agha o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ nke e ji bronz kpụọ, nyakwasịkwa nʼubu ya ùbe e ji bronz kpụọ.
7A kpụrụ ùbe ya ka ọ dịrị ka osisi e ji ekwe akwa, jiri igwe ịdị arọ ya ga-eru kilogram asaa kpụọ ọnụ ọnụ ùbe ahụ. Onye na-ebu ọta o ji ekpuchi obi ya nọkwa nʼihu ya.