54Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya.
55Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?” Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.”
56Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.”
57Mgbe Devid si nʼigbu onye Filistia ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye Filistia a dịkwa nʼaka Devid.
58Sọl jụrụ ya sị, “Nwokorobịa, nwa onye ka ị bụ?” Devid zara sị, “Abụ m nwa ohu gị nwoke Jesi onye Betlehem.”