7A kpụrụ ùbe ya ka ọ dịrị ka osisi e ji ekwe akwa, jiri igwe ịdị arọ ya ga-eru kilogram asaa kpụọ ọnụ ọnụ ùbe ahụ. Onye na-ebu ọta o ji ekpuchi obi ya nọkwa nʼihu ya.
8Golaịat guzoro kpọkuo ndị agha Izrel sị ha, “Gịnị mere unu ga-eji pụta guzo nʼusoro ibu agha. Ọ bụ na m abụghị onye Filistia? Ọ bụkwa na unu onwe unu abụghị ndị ozi Sọl? Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ bịakwute m.
9Ọ bụrụ na onye ahụ unu họpụtara etigbuo m, anyị ga-abụrụ unu ndị ohu, ma ọ bụrụkwanụ na m etigbuo ya, unu ga-abụrụ anyị ndị ohu!”
10Mgbe ahụ, onye Filistia ahụ sịrị, “Taa, ana m ama usuu ndị agha Izrel aka nʼihu! Kpọpụtaranụ m otu nwoke ka mụ na ya lụọ ọgụ.”
11Mgbe Sọl na ndị agha Izrel nụrụ ihe onye Filistia a kwuru, ha mara jijiji tụọkwa oke egwu.