9Site nʼụbọchị ahụ gawa, Sọl malitere ile Devid anya ọjọọ.
10Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka.
11Ọ tụrụ ùbe ahụ, kwuo nʼobi ya sị, “Aga m atụgide Devid nʼaja ụlọ ahụ.” Ma Devid wezugara onwe ya, ugboro abụọ ndị a.
12Sọl na-atụ Devid egwu, nʼihi na Onyenwe anyị ahapụla Sọl, ma nọnyere Devid.
13Emesịa, Sọl mere ihe ga-eme ka ọ ghara ịhụkwa Devid anya ọzọ. O mere Devid ka ọ bụrụ onye na-elekọta puku ndị agha, ndị ọ na-edu na-aga ibu agha.