1 Samuel 18

Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.

1 Samuel 18:27 (UKJV) Wherefore David arose and went, he and his men, and slew of the Philistines two hundred men; and David brought their foreskins, and they gave them in full tale to the king, that he might be the king's son in law. And Saul gave him Michal his daughter to wife.

25ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ.

26Mgbe ndị ohu eze gwara Devid ihe eze kwuru, ọ tọrọ ya ụtọ, nʼihi ya, o kwenyere ịbụ ọgọ eze. Tupu oge ahụ a kara aka eruo,

27Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.

28Mgbe Sọl hụrụ na Onyenwe anyị na-anọnyere Devid, hụkwa na Mikal nwa ya nwanyị hụrụ Devid nʼanya,

29ọ tụrụ Devid ụjọ karịa na mbụ. Sọl kpọkwara Devid asị, gụọ ya dịka onye iro ụbọchị ndụ ya niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.