1 Samuel 18

Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.

1 Samuel 18:3 (UKJV) Then Jonathan and David made a covenant, because he loved him as his own soul.

1Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu, ịhụnanya dị ukwuu malitere nʼetiti Jonatan na Devid. Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.

2Sọl mere ka Devid nọgide nʼụlọeze. O kwekwaghị ka ọ laghachi nʼụlọ nna ya.

3Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.

4Jonatan yipụtara uwe o yi nʼahụ nye ya Devid, nyekwa ya uwe ime ahụ ya, na ọ bụladị mma agha ya, ma ụta ya na eriri ukwu ya.

5Devid jeziri ozi niile Sọl ziri ya, o mere ihe niile nke ọma nke a mere na Sọl nyere ya ọkwa dị elu nʼetiti ndị agha ya. Ọnọdụ a dị mma nʼanya ndị Izrel nakwa nʼanya ndị agha Sọl.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.