4Jonatan yipụtara uwe o yi nʼahụ nye ya Devid, nyekwa ya uwe ime ahụ ya, na ọ bụladị mma agha ya, ma ụta ya na eriri ukwu ya.
5Devid jeziri ozi niile Sọl ziri ya, o mere ihe niile nke ọma nke a mere na Sọl nyere ya ọkwa dị elu nʼetiti ndị agha ya. Ọnọdụ a dị mma nʼanya ndị Izrel nakwa nʼanya ndị agha Sọl.
6Mgbe ndị agha ahụ na-alọghachite, mgbe Devid gbusịrị onye Filistia ahụ, ndị inyom sitere nʼobodo niile nke Izrel pụta izute eze Sọl. Ha na-abụ abụ na-ete egwu ọṅụ, nke ha ji ụbọ akwara na ihe egwu ndị ọzọ na-eti.
7Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị, “Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.”
8Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?”