1Sọl gwara ndị ohu ya na ọkpara ya, Jonatan, ka ha gbuo Devid. Ma nʼihi na ihe banyere Devid masịrị Jonatan,
2ọ dọrọ ya aka na ntị, “Nna m Sọl na-achọ ohere igbu gị. Lezie anya chee ndụ gị nche, ụtụtụ echi, gaa nʼebe ị ga-ezo onwe gị nọdụ nʼebe ahụ.
3Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.”
4Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu.