4“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
5Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.
6“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.
7Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
8Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.