2“O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
3“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.
4“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
5Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.
6“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.