11Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa.
12Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata.
13Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka Onyenwe anyị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka Onyenwe anyị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m.
14Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ.
15E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.”