19Nwanne echi ya, nʼoge uhuruchi, gaa nʼebe ahụ i zoro onwe gị mgbe nsogbu a malitere, chere nʼebe ahụ, nʼakụkụ nkume Ezel.
20Aga m abịa gbaa àkụ atọ nʼakụkụ ya dịka a ga-asị na o nwere ihe m chọrọ iji ụta m gbata.
21Emesịa, aga m ezipu otu nwantakịrị sị ya, ‘Gaa chọta àkụ ndị ahụ.’ Ọ bụrụ na ị nụ ka m na-agwa ya okwu sị, ‘Lee àkụ ndị a dị nʼakụkụ azụ gị, chita ha ebe a,’ mgbe ahụ, pụta nʼihi, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, udo dịrị gị, egwu ọbụla adịghị.
22Ma ọ bụrụ na m agwa nwantakịrị ahụ okwu sị ya, ‘Lee, àkụ ahụ dị nʼihu gị,’ ọ pụtara na ị ghaghị isi nʼebe a pụọ, nʼihi na Onyenwe anyị ezipụla gị.
23Ma ihe banyere okwu ahụ anyị kwuru, cheta na Onyenwe anyị bụ onye akaebe, nʼetiti mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.”