1 Samuel 20

Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.”

1 Samuel 20:37 (UKJV) And when the lad was come to the place of the arrow which Jonathan had shot, Jonathan cried after the lad, and said, Is not the arrow beyond you?

35Nʼụtụtụ echi ya, dịka ha kara aka, Jonatan gara nʼọhịa, ya na nwantakịrị nwoke so gaa.

36Ọ sịrị nwantakịrị nwoke ahụ, “Gbara ọsọ gaa chọta àkụ ndị ahụ niile m na-agba.” Mgbe nwantakịrị ahụ na-agba ọsọ na-aga, Jonatan gbapụrụ àkụ, gbafee ya nʼihu nwantakịrị ahụ.

37Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.”

38Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu.

39Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.