1 Samuel 20

Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.

1 Samuel 20:39 (UKJV) But the lad knew not any thing: only Jonathan and David knew the matter.

37Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.”

38Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu.

39Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.

40Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.

41Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.