1 Samuel 20

Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.

1 Samuel 20:40 (UKJV) And Jonathan gave his artillery unto his lad, and said unto him, Go, carry them to the city.

38Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu.

39Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.

40Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.

41Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa.

42Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.