2Jonatan sịrị ya, “Nke a abụghị eziokwu. Ị gaghị anwụ! Ihe dị otu a adịghị nna m nʼobi, nʼihi na ọ na-agwa m ihe ọbụla ọ na-ezube ime, ọ bụladị ihe ukwu maọbụ ihe ntakịrị. Amakwaara m na ọ gaghị ezonarị m ihe dị otu a. Mba, ọ bụghị eziokwu.”
3Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m Onyenwe anyị na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.”
4Jonatan sịrị Devid, “Ihe ọbụla ị chọrọ ka m mee, aga m emere gị ya.”
5Devid sịrị ya, “Lee echi ga-abụ mmemme ọnwa ọhụrụ, e kwesiri m iso eze rie nri. Ma hapụ m ka m ga zoo onwe m nʼọhịa tutu ruo uhuruchi nke nwanne echi.
6Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’