1Devid jere nʼobodo Nob ịhụ Ahimelek, onye nchụaja. Ahimelek mara jijiji mgbe ọ hụrụ Devid. Ọ sịrị Devid, “Gịnị mere naanị gị ji bịa? Gịnị mere o nweghị onye so gị?”
2Devid zara Ahimelek, onye nchụaja sị, “Eze ziri m ozi dị mkpa, ma sị m, ‘Ka onye ọbụla ghara ịma ihe ọbụla banyere ozi a m na-eziga gị.’ Ma banyere ụmụ okorobịa m, agwala m ha ebe ha ga-ezute m.
3Ugbu a, olee ihe oriri i nwere? Nye m ogbe achịcha ise maọbụ ihe ọzọ i nwere.”
4Onye nchụaja ahụ zara Devid sị, “Enweghị m achịcha ana edoghị nsọ nʼebe a. Ma otu ọ dị, e nwere ụfọdụ achịcha e doro nsọ nʼebe a, ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị na ha so debere onwe ha ọcha, na-emetụghị nwanyị ahụ.”
5Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.”