1 Samuel 22

Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.

1 Samuel 22:18 (UKJV) And the king said to Doeg, Turn you, and fall upon the priests. And Doeg the Edomite turned, and he fell upon the priests, and slew on that day fourscore and five persons that did wear a linen ephod.

16Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”

17O nyere ndị na-eso ya iwu sị ha, “Gbuonụ ndị nchụaja ndị a, nʼihi na ha na Devid agbaala izuzu; ha makwa na o si nʼihu m na-agbapụ, ma ha agwaghị m!” Ma ndị agha eze jụrụ isetipụ aka ha megide ndị nchụaja Onyenwe anyị.

18Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.

19O ji mma agha jee Nob, obodo ndị nchụaja, gbuo ezinaụlọ ndị nchụaja niile, nwoke na nwanyị, na ụmụntakịrị, na ụmụ na-aṅụ ara. O gbukwara ehi na ịnyịnya ibu na atụrụ ha niile.

20Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.