1 Samuel 22

Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”

1 Samuel 22:16 (UKJV) And the king said, You shall surely die, Ahimelech, you, and all your father's house.

14Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị?

15Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.”

16Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”

17O nyere ndị na-eso ya iwu sị ha, “Gbuonụ ndị nchụaja ndị a, nʼihi na ha na Devid agbaala izuzu; ha makwa na o si nʼihu m na-agbapụ, ma ha agwaghị m!” Ma ndị agha eze jụrụ isetipụ aka ha megide ndị nchụaja Onyenwe anyị.

18Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.