12Sọl gwara ha okwu sị, “Gee ntị, gị nwa Ahitub.” Ahimelek zara sị, “Ana m ege ntị, onyenwe m.”
13Sọl jụrụ ya sị, “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaa izu imegide m? Gịnị mere i ji nye ya nri na mma agha, jụkwaara ya ase site nʼaka Chineke? Gịnị mere i ji na-agba ya ume ka o nupu isi nʼebe m nọ, na ka ọ bịakwa nʼebe a imegide m taa?”
14Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị?
15Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.”
16Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”