2Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya.
3Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?”
4Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike.
5Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret.
6Ugbu a Sọl nụrụ na achọtala ebe Devid na ndị ikom na-eso ya nọ. Sọl, onye ji ùbe ya nʼaka nọdụrụ ala nʼokpuru osisi tamarisk nke dị nʼugwu dị na Gibea. Ndị ozi ya guzokwa gburugburu ya.