1Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ.
2Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya.
3Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?”
4Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike.