20Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.”
21Sọl zara ha sị, “Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi mmetụta ọnọdụ m na-emetụta unu nʼobi.
22Gaanụ chọpụta nke ọma ebe ọ na-ezo onwe ya, na onye hụrụ ya, nʼihi na agwara m na ọ bụ onye aghụghọ.
23Chọpụtanụ ebe ọ na-ezo onwe ya ma lọghachikwanụ bịa gwa m ihe unu chọpụtara. Mgbe ahụ, aga m eso unu jee. Ọ bụrụ na ọ nọ nʼala ahụ, aga m achọpụta ya; e, aga m enyobanye anya chọọ ya nʼikwu niile nke Juda.”
24Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn.