14“Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị?
15Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.”
16Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa.
17Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m.
18E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe Onyenwe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m.