17Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m.
18E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe Onyenwe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m.
19Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa.
20Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel.
21Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.”