1 Samuel 24

Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye Onyenwe anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ bụ.”

1 Samuel 24:6 (UKJV) And he said unto his men, The LORD forbid that I should do this thing unto my master, the LORD's anointed, to stretch forth mine hand against him, seeing he is the anointed of the LORD.

4Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya.

5Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl.

6Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye Onyenwe anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ bụ.”

7Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ.

8Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.