1 Samuel 24

Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ?

1 Samuel 24:9 (UKJV) And David said to Saul, Wherefore hear you men's words, saying, Behold, David seeks your hurt?

7Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ.

8Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala.

9Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ?

10Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’

11Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.