1 Samuel 25

Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche.

1 Samuel 25:13 (UKJV) And David said unto his men, Gird all of you on every man his sword. And they girded on every man his sword; and David also girded on his sword: and there went up after David about four hundred men; and two hundred abode by the stuff.

11M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?”

12Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru.

13Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche.

14Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba.

15Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.