26Ugbu a, onyenwe m, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal.
27Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị.
28“Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha Onyenwe anyị ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
29Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe.
30Mgbe Onyenwe anyị mezuru nye onyenwe m ihe ọma niile nke o kwere na nkwa, meekwa ya onyendu ndị Izrel,