39Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.” Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya.
40Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.”
41Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.”
42Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid.
43Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya.