42Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid.
43Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya.
44Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.