1 Samuel 26

Ugbu a ka onyenwe m eze gee ntị nʼokwu ohu ya: Ọ bụrụ na Onyenwe anyị kpaliri gị imegide m, mgbe ahụ arịrịọ m bụ ka Onyenwe anyị nara onyinye ịnata ihuọma. Otu ọ dị, a si na ọ bụ ndị mmadụ na-akpali gị imegide m, ka ndị dị otu a bụrụ ndị a bụrụ ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi na ha esitela nʼoke m nwere nʼihe nketa Onyenwe anyị chụpụ m, sị m, ‘Gaa fee chi ndị ọzọ ofufe.’

1 Samuel 26:19 (UKJV) Now therefore, I pray you, let my lord the king hear the words of his servant. If the LORD have stirred you up against me, let him accept an offering: but if they be the children of men, cursed be they before the LORD; for they have driven me out this day from abiding in the inheritance of the LORD, saying, Go, serve other gods.

17Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ olu Devid, ọ sịrị, “Ọ bụ gị nwa m, Devid?” Devid zara sị ya, “E, ọ bụ olu m, onyenwe m, eze.”

18Ọ sịkwa, “Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achụgharị ohu ya? Gịnị ka m mere? Gịnịkwa bụ ihe ọjọọ ị chọtara nʼaka m?

19Ugbu a ka onyenwe m eze gee ntị nʼokwu ohu ya: Ọ bụrụ na Onyenwe anyị kpaliri gị imegide m, mgbe ahụ arịrịọ m bụ ka Onyenwe anyị nara onyinye ịnata ihuọma. Otu ọ dị, a si na ọ bụ ndị mmadụ na-akpali gị imegide m, ka ndị dị otu a bụrụ ndị a bụrụ ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi na ha esitela nʼoke m nwere nʼihe nketa Onyenwe anyị chụpụ m, sị m, ‘Gaa fee chi ndị ọzọ ofufe.’

20Ugbu a, ekwela ka ọbara m bụrụ ihe a wufuru nʼala dị anya, na-abụghị nʼihu Onyenwe anyị. Eze Izrel apụtala ịchọ akpị dịka m, otu dinta si achọgharị ọkwa nʼelu ugwu.”

21Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.