22Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya.
23Onyenwe anyị na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ.
24Ugbu a, ka Onyenwe anyị zọpụta ndụ m, ọ bụladị dịka m sị zọpụta ndụ nke gị taa. Ka ọ napụtakwa m site na mkpagbu m niile.”
25Sọl sịrị Devid, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nwa m, Devid. Ị ga-eme oke ihe, bụrụkwa onye na-emeri nʼagha.” Devid sitere nʼebe ahụ pụọ. Sọl laghachikwara nʼụlọ ya.