1 Samuel 26

Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara,

1 Samuel 26:3 (UKJV) And Saul pitched in the hill of Hachilah, which is before Jeshimon, by the way. But David abode in the wilderness, and he saw that Saul came after him into the wilderness.

1Ndị Zif jekwuru Sọl na Gibea gwa ya na Devid na-ezo onwe ya nʼugwu Hakila nke chere ihu nʼọzara.

2Nʼihi ya, Sọl biliri chịrị puku ndị agha atọ o leziri anya họpụta nʼetiti ndị agha Izrel, duru ha gaa nʼọzara Zif ịchọ Devid.

3Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara,

4Devid zipụrụ ndị nledo, matakwa na Sọl bịara nʼezie.

5Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.