1Devid chere nʼime onwe ya sị, “Otu ụbọchị Sọl ga-enweta m, bibie m. Ihe ka mma m ga-eme bụ ịgbaga nʼala ndị Filistia. Nke a ga-eme ka Sọl kwụsị ịchọgharị m ebe ọbụla nʼIzrel. Aga m esikwa otu a, nwere onwe m site nʼaka ya.”
2Ya mere, Devid na narị ndị ikom isii ya, na ezinaụlọ ha, biliri jekwuru Akish nwa Maok, eze ndị Gat.
3Devid na ndị agha ya sooro Akish biri na Gat. Onye ọbụla du ezinaụlọ ya. Devid nʼonwe ya du ndị inyom abụọ ya: Ahinoam onye Jezril, na Abigel onye Kamel, nwunye ochie Nebal.
4Ọ dịghị anya, Sọl nụrụ na Devid agbalaala Gat, nʼihi ya ọ kwụsịrị ịchụso ya.
5Devid gwara Akish sị ya, “Ọ bụrụ na m anatala amara nʼebe ị nọ, ọ ga-adị mma ka enye m otu obodo nʼime obodo nke ala a, ka m biri. Nʼihi gịnị ka ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?”