9Akish zaghachiri, “Ama m nʼonye dị mma ka ị bụ nʼanya m, dịka mmụọ ozi nke Chineke. Nʼagbanyeghị nke a, ọchịagha ndị Filistia asịla, ‘Ọ gaghị eso anyị jee nʼagha.’
10Ya mere, bilie nʼisi ụtụtụ, gị na ndị ọrụ onyenwe gị ndị soro gị bịa, bilienụ nʼisi ụtụtụ laghachi mgbe ìhè dịrị unu.”
11Devid na ndị ikom na-eso ya biliri nʼisi ụtụtụ ịlaghachi nʼala ndị Filistia. Ma ndị agha ndị Filistia gara nʼihu jeruo Jezril.