4Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?”
5Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị, “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?”
6Ya mere, Akish kpọrọ Devid sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Ọ gaara atọ m ụtọ ka ị soro m buo agha. Site na mgbe ị bịakwutere m tutu ruo ugbu a, o nweghị mmejọ ọbụla m chọpụtara nʼime gị. Ma ndịisi anyị anabataghị gị.
7Ugbu a, laghachinụ azụ, laa nʼudo. Unu emeela ihe ọbụla ga-akpasu ndịisi ndị Filistia iwe.”
8Devid jụrụ Akish, “Ma gịnị ka m mere? Gịnịkwa ka ị hụtara megide ohu gị site nʼụbọchị m bịakwutere gị ruo taa? Gịnị ga-eme ka m ghara ịlụso ndị iro onyenwe m, bụ eze agha?”