1 Samuel 3

Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo.

1 Samuel 3:19 (UKJV) And Samuel grew, and the LORD was with him, and did let none of his words fall to the ground.

17Elayị jụrụ ya sị, “Gịnị ka ọ gwara gị? Ezola ihe ọbụla nʼebe m nọ. Ka Chineke mesoo gị mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na i zoo ihe ọbụla ọ gwara gị nʼebe m nọ.”

18Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.”

19Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo.

20Ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, matara na Samuel bụ onye amụma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.

21Onyenwe anyị gakwara nʼihu na-egosi onwe ya na Shaịlo. Nʼebe ahụ o gosiri onwe ya nye Samuel site nʼokwu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.