10narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha.
11Ha hụrụ otu nwokorobịa onye Ijipt nʼọhịa, duuru ya bịakwute Devid. Ha nyere ya mmiri ka ọ ṅụọ, nyekwa ya nri ka o rie.
12Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig, na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị.
13Mgbe ahụ, Devid jụrụ ya sị, “Ị bụ onye? Ebeekwa ka i si bịa?” Ọ zara Devid sị, “Abụ m onye Ijipt, bụrụkwa ohu onye Amalek. Onyenwe m hapụrụ m nʼebe a abalị atọ gara aga nʼihi na ahụ adịghị m ike.
14Anyị si obodo ebe anyị gara lụọ agha na-alọghachi mgbe ha hapụrụ m nʼebe a. Anyị gara lụgbuo obodo ndị Keret, nke dị nʼime Negeb, na obodo dị na ndịda ala Juda na ala Kaleb. Anyị gbakwara obodo Ziklag ọkụ.”