1 Samuel 30

Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga.

1 Samuel 30:17 (UKJV) And David stroke them from the twilight even unto the evening of the next day: and there escaped not a man of them, save four hundred young men, which rode upon camels, and fled.

15Devid jụrụ ya sị, “I nwere ike duru m gaa ebe ha nọ.” Nwokorobịa ahụ zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke na ị gaghị egbu m maọbụ were m nyeghachi onyenwe m, aga m eduru gị gaa ebe ha nọ.”

16O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda.

17Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga.

18Devid nwetaghachiri ihe niile ndị Amalek kwatara nʼagha, tinyere ndị inyom ya abụọ.

19O nweghị ihe furu efu, ma nke ukwu ma nke nta, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ihe a kwatara nʼagha, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ndị Amalek dọtara nʼagha. Devid nwetaghachiri ihe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.