1 Samuel 30

Mgbe Devid na ndị ikom ya ruru Ziklag, ha hụrụ na-esuola ya ọkụ, dọkpụrụ ndị inyom ha, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼagha.

1 Samuel 30:3 (UKJV) So David and his men came to the city, and, behold, it was burned with fire; and their wives, and their sons, and their daughters, were taken captives.

1Mgbe Devid na ndị ikom ya rutere obodo Ziklag nʼụbọchị nke atọ, ha hụrụ na ndị Amalek abịala wakporo bi nʼakụkụ ndịda Negev na Ziklag. Ha buru agha megide Ziklag, gbaa obodo ahụ ọkụ,

2dọtakwa ndị inyom na ndị niile bi nʼime ya nʼagha, ma okenye ma ụmụntakịrị. Ha egbughị ha egbu, kama ha buuru ha laa.

3Mgbe Devid na ndị ikom ya ruru Ziklag, ha hụrụ na-esuola ya ọkụ, dọkpụrụ ndị inyom ha, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼagha.

4Ya mere, Devid na ndị ikom ya kwara akwa ruo mgbe ike akwa gwụrụ ha.

5Ndị inyom abụọ Devid, Ahinoam onye Jezril na Abigel, nwunye ochie Nebal onye Kamel, sokwa na ndị a dọtara nʼagha ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.