1 Samuel 30

Ya mere, Devid na ndị ikom ya kwara akwa ruo mgbe ike akwa gwụrụ ha.

1 Samuel 30:4 (UKJV) Then David and the people that were with him lifted up their voice and wept, until they had no more power to weep.

2dọtakwa ndị inyom na ndị niile bi nʼime ya nʼagha, ma okenye ma ụmụntakịrị. Ha egbughị ha egbu, kama ha buuru ha laa.

3Mgbe Devid na ndị ikom ya ruru Ziklag, ha hụrụ na-esuola ya ọkụ, dọkpụrụ ndị inyom ha, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼagha.

4Ya mere, Devid na ndị ikom ya kwara akwa ruo mgbe ike akwa gwụrụ ha.

5Ndị inyom abụọ Devid, Ahinoam onye Jezril na Abigel, nwunye ochie Nebal onye Kamel, sokwa na ndị a dọtara nʼagha ahụ.

6Ihe a wetaara Devid oke nsogbu, nʼihi na ndị ikom ya nọ na-ekwu okwu iji nkume tugbuo ya; ha niile nọ nʼobi ilu nʼihi ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ma Devid chọtara ike nʼime Onyenwe anyị Chineke ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.