5Ndị inyom abụọ Devid, Ahinoam onye Jezril na Abigel, nwunye ochie Nebal onye Kamel, sokwa na ndị a dọtara nʼagha ahụ.
6Ihe a wetaara Devid oke nsogbu, nʼihi na ndị ikom ya nọ na-ekwu okwu iji nkume tugbuo ya; ha niile nọ nʼobi ilu nʼihi ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ma Devid chọtara ike nʼime Onyenwe anyị Chineke ya.
7Devid sịrị Abịata, bụ onye nchụaja, nwa Ahimelek, “Chịtara m efọọd ahụ.” Ya mere, Abịata chịtara ya nye ya
8Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m chụso ndị a na-apụnara ndị mmadụ ihe? Ọ bụrụ na m achụso ha, aga m ejide ha?” Onyenwe anyị zara, “E, chụso ha ọsọ, ị ga-achụkwute ha, ma nataghachikwa ihe niile ha were.”
9Mgbe ahụ, Devid na narị ndị agha isii ya bịarutere nʼọdọ mmiri Beso, ebe ha hapụrụ ụfọdụ ndị