6Ihe a wetaara Devid oke nsogbu, nʼihi na ndị ikom ya nọ na-ekwu okwu iji nkume tugbuo ya; ha niile nọ nʼobi ilu nʼihi ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ma Devid chọtara ike nʼime Onyenwe anyị Chineke ya.
7Devid sịrị Abịata, bụ onye nchụaja, nwa Ahimelek, “Chịtara m efọọd ahụ.” Ya mere, Abịata chịtara ya nye ya
8Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m chụso ndị a na-apụnara ndị mmadụ ihe? Ọ bụrụ na m achụso ha, aga m ejide ha?” Onyenwe anyị zara, “E, chụso ha ọsọ, ị ga-achụkwute ha, ma nataghachikwa ihe niile ha were.”
9Mgbe ahụ, Devid na narị ndị agha isii ya bịarutere nʼọdọ mmiri Beso, ebe ha hapụrụ ụfọdụ ndị
10narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha.