1 Samuel 4

Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ.

1 Samuel 4:15 (UKJV) Now Eli was ninety and eight years old; and his eyes were dim, that he could not see.

13Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile.

14Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?” Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu.

15Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ.

16Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.” Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?”

17Onyeozi ahụ zara sị, “Izrel sitere nʼihu ndị Filistia gbaa ọsọ. E tigbukwara ọtụtụ nʼime ndị agha ha. Ọzọ, ụmụ gị abụọ, Hofni na Finehaz nwụrụ. E burukwara igbe ọgbụgba ndụ Chineke.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.