1 Samuel 4

Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?” Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu.

1 Samuel 4:14 (UKJV) And when Eli heard the noise of the crying, he said, What means the noise of this tumult? And the man came in hastily, and told Eli.

12Ma otu nwoke onye Benjamin gbapụrụ ọsọ site nʼọgbọ agha ahụ, gbara ruo Shaịlo nʼotu ụbọchị ahụ, o yi uwe dọwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.

13Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile.

14Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?” Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu.

15Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ.

16Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.” Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.