17Onyeozi ahụ zara sị, “Izrel sitere nʼihu ndị Filistia gbaa ọsọ. E tigbukwara ọtụtụ nʼime ndị agha ha. Ọzọ, ụmụ gị abụọ, Hofni na Finehaz nwụrụ. E burukwara igbe ọgbụgba ndụ Chineke.”
18Mgbe onyeozi ahụ kwutere maka igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Elayị sitere nʼoche ya dalaa azụ nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dajie olu ya, nwụọ! Nʼihi na o meela nnọọ agadi. Ọ bụkwa onye buru ibu. Ya onwe ya kpekwara ụmụ Izrel ikpe iri afọ anọ.
19Nwunye nwa ya, bụ nwunye Finehaz, dị ime, nọọkwa nso oge ịmụ nwa ya. Mgbe ọ nụrụ maka obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nụkwa maka ọnwụ nna di ya na di ya, ọ mụpụtara nwa ya nʼike. Ma ọ nwụrụ nʼihi ihe mgbu nke afọ ime.
20Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị.
21Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya.